1:5 |
na site na Jisus Kraist, onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, ọkpara nke ndi nwuru anwu, na onye-ndú nke ndi-eze nke uwa, Onye huworo ayi n'anya, were kwa ọbara-Ya sa ayi na nmehie nile ayi, |
1:6 |
Onye me-kwa-ra ayi ka ayi buru ala-eze na ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Nna-Ya. Ka otuto na ọchịchị dịrị ya ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. |
1:7 |
Lee, o ji igwe-oji bia, anya nile gāhu kwa ya, ọbụna ndị mara ya ube. Ebo nile nke uwa gākwa-kwa-ra onwe-ha ákwá ike bayere ya. Bụlagodi. Amen. |
1:8 |
“Abụ m Alfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, onye bu, na onye bụ, na onye gaje ibia, Onye puru ime ihe nile. |
Leave a Reply
You must be logged in to post a comment.