December 22, 2011, Oziọma

Oziọma Nsọ Dị ka Luk si kwuo 1: 46-56

1:46 Meri we si: “Mkpụrụ obi m na-asọpụrụ Jehova.
1:47 Mọm nāwuli kwa n'ọṅù nime Chineke Onye-nzọputam.
1:48 N'ihi na o lekwasiwo obi-ume-ala nke orù-ya nwayi anya. N'ihi na le, site n'oge a, Ọb͕ọ nile gākpọm onye agọziri agọzi.
1:49 N'ihi na onye uku emewom ihe uku, aha-Ya di kwa nsọ.
1:50 Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ nile.
1:51 O werewo ogwe-aka ya rụọ ọrụ dị ike. Ọ chụsasịwo ndị mpako na nzube nke obi ha.
1:52 Ọ chụpụwo ndị dị ike n’oche ha, Ọ bu kwa ndi di ume-ala n'obi ka Ọ buliworo.
1:53 O werewo ihe ọma mejuo ndị agụụ na-agụ, ọ bu kwa ndi-ọgaranya ka o zipuru n'aka efu.
1:54 O werewo ohu ya Izrel, na-echeta ebere ya,
1:55 dika Ọ gwara nna-ayi-hà: nye Abraham na ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”
1:56 Meri we nọyere ya ihe ra ka ọnwa atọ. O we laghachi n'ulo-ya.

 


Okwu

Leave a Reply