The First Book of Kings 21: 17-29
21:17 | Okwu Jehova we rue Elaija nti, onye Tishbe, na-ekwu: |
21:18 | “Bilie, gbadata izute Ehab, eze Israel, onye nọ na Sameria. Lee, ọ na-agbada n’ubi vaịn Nebọt, ka o we were ya. |
21:19 | I gāgwa kwa ya okwu, na-ekwu: ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: I gbuola. Ọzọkwa, unu enwetawokwa.’ Ma emesịa, ị ga-atụkwasị: ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: N'ebe a, ebe nkita rachaworo ọbara Nebot, ha ga-arachakwa ọbara unu.” |
21:20 | Ehab we si Elaija, “Ị̀ chọpụtawo na m bụ onye iro gị?O we si: “Achọpụtara m na e rerela gị, ka unu we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: |
21:21 | ‘Lee, M ga-edu ihe ọjọọ n'isi gị. + M ga-egbutukwa ụmụ unu. M'gēme kwa ka Ehab nwua, bú ihe ọ bula nke nāmamiri n'elu mb͕idi, na ihe ọ bụla dara ngwụrọ, na ihe ọ bula nke ikpe-azu n'Israel. |
21:22 | M'gēme kwa ka ulo-gi di ka ulo Jeroboam, nwa Nebat, na dika ulo Beasha, nwa Ahaija. N'ihi na i mewo ihe na-akpasu m iwe, + i wee mee ka Izrel mehie.’ |
21:23 | Na banyere Jezibel kwa, Jehova kwuru, na-ekwu: ‘Nkịta ga-erichapụ Jezibel n’ọhịa Jezrel. |
21:24 | Ọ bụrụ na Ehab anwụọla n’obodo ahụ, nkita gēripia ya. Ma ọ bụrụ na ọ ga-anwụ n'ọhịa, anụ ufe nke eluigwe ga-eripịa ya.’ ” |
21:25 | Ya mere, ọ dighi kwa onye ọzọ di ka Ehab, onye rere, o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova. Maka nwunye ya, Jezibel, gbara ya ume. |
21:26 | O wee ghọọ ihe arụ, nke mere na o jesoro arusi nile nke ndi-Amorait mere, onye Jehova kpochapuru n'iru umu Israel. |
21:27 | Mgbe ahụ, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, ọ dọwara uwe ya, o we tiye ákwà-nb͕okwasi-ya n'aru-ya, o we bue ọnu, o we raru n'ákwà-nkpe, o we nēje ije nēweda isi-ya. |
21:28 | Okwu Jehova we rue Elaija nti, onye Tishbe, na-ekwu: |
21:29 | “Ị̀ hụbeghị otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihu m? Ya mere, n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'ihim, M'gaghi-edu n'ihe ọjọ n'ubọchi-ya;. Kama, n'ubọchi nwa-ya nwoke, M'gēme kwa ka ihe ọjọ bata n'ulo-ya.
|
Leave a Reply
You must be logged in to post a comment.