21:20 |
Mgbe ahụ, mb͕e i gāhu Jerusalem ka ndi-agha buruburu, marakwanụ na ịtọgbọrọ n'efu ya eruwo nso. |
21:21 |
Ya mere, ka ndi nọ na Judia b͕alaga n'ugwu, ndi nọ kwa n'etiti ya nālaghachi, ma ndị nọ n’ime ime obodo adịghị abanye n’ime ya. |
21:22 |
N'ihi na ndia bu ubọchi nkwughachi;, ka ewe mezu ihe nile, nke edeworo. |
21:23 |
Ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime ma ọ bụ ndị na-enye ara n'ụbọchị ndị ahụ. N'ihi na oké nkpab͕u gādi n'ala nka na oké iwe gādikwasi ndi nka. |
21:24 |
+ Ha ga-adakwa n’ọnụ mma agha. + A ga-adọrọkwa ha n’agha gaa ná mba niile. Ndị mba ọzọ ga-azọkwa Jeruselem ụkwụ, rue mb͕e oge nile nke mba nile gēzu. |
21:25 |
A ga-enwekwa ihe ịrịba ama na anyanwụ na ọnwa na kpakpando. A ga-enwekwa, n'ụwa, nkpab͕u n'etiti ndi mba ọzọ, site n'ọgbaaghara n'ibib͕ọ nke oké osimiri na nke ebili-miri: |
21:26 |
ndị ikom na-akpọnwụ n'ihi egwu na n'ihi ụjọ maka ihe ndị ga-ekpu n'elu ụwa dum. N'ihi na a ga-emegharị ike nke eluigwe. |
21:27 |
Mgbe ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n'ígwé ojii, n'oke ike na ima-nma. |
21:28 |
Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, welie isi-unu legide unu anya, n’ihi na mgbapụta gị na-eru nso.” |
Leave a Reply
You must be logged in to post a comment.