November 24, 2012, Ọgụgụ

The Book of Revelation 11: 4-12

11:4 Ndia bu osisi olive abua na ihe-idọba-oriọna abua ahu, iguzo n'iru Onye-nwe uwa.
11:5 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-achọ imerụ ha ahụ, ọku gēsi n'ọnu-ha puta, Ọ gēripia kwa ndi-iro-ha. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-achọ imerụ ha ahụ, otú a ka aghaghi ib͕u ya.
11:6 Ndị a nwere ike imechi eluigwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi ha nēbu amuma. + Ha nwekwara ike n’ebe mmiri dị, ime ka ha ghọọ ọbara, na iji ụdị mkpagbu ọ bụla tie ụwa mgbe ọ bụla ha chọrọ.
11:7 Ma mgbe ha ga-agbachara akaebe ha, anụ ọhịa ahụ nke si n’abis rịgote ga-ebuso ha agha, ọ ga-emerikwa ha, ọ ga-egbukwa ha.
11:8 Ma ozu-ha ga-atọgbọrọ n’okporo ámá nke Obodo ukwu ahụ, nke a na-akpọ ‘Sọdọm’ na ‘Ijipt’ n’ụzọ ihe atụ,’ Ebe a kpọgidekwara Onyenwe ha n’obe.
11:9 Ndị si n’ebo nile na ndị nile na asụsụ nile na mba nile ga na-ele ahụ ha anya ruo ụbọchị atọ na ọkara. Ma ha agaghị ekwe ka e debe ozu ha n’ili.
11:10 + Ndị bi n’ụwa ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ha, ha ga-emekwa ememe, + ha ga-eziterekwa ibe ha onyinye, n’ihi na ndị amụma abụọ a tara ndị bi n’ụwa ahụhụ.
11:11 Ma mgbe ụbọchị atọ na otu ọkara gasịrị, mmụọ nke ndụ nke sitere na Chineke banyere n’ime ha. Ha we guzo ọtọ n'ukwu-ha. Oké egwu we dakwasi ndi huru ha.
11:12 Ha we nu oké olu sitere n'elu-igwe, na-agwa ha, “Rịgo ebe a!Ha we rigo n'elu-igwe n'elu-igwe. Ndị iro ha hụkwara ha.

Okwu

Leave a Reply