1:39 |
Na n'ụbọchị ndị ahụ, Meri, na-ebili, je ngwa ngwa ba n'ugwu ahu, je n'obodo Juda. |
1:40 |
O we ba n'ulo Zekaraia, o we kele Elizabet. |
1:41 |
O wee mee nke ahụ, dika Elizabet nuru ekele Meri, Nwa ọhụrụ maliri n’afọ ya, Elizabet we juputa na Mọ Nsọ. |
1:42 |
O we tie nkpu n'oké olu, si: “Ngọzi na-adịrị gị n'etiti ụmụ nwanyị, Ngọzi nādi-kwa-ra nkpuru nke afọ-gi. |
1:43 |
Oleekwa otú nke a si gbasa m, ka nne nke Onye-nwem biakutem? |
1:44 |
N'ihi na le, dika olu ekele-gi si bia na ntim, Nwa ọhụrụ nọ n'afọ m maliri n'ọṅụ. |
1:45 |
Ngọzi nādi-kwa-ra unu ndi kwere, n’ihi na ihe ndị Jehova gwara unu ga-emezu.” |
1:46 |
Meri we si: “Mkpụrụ obi m na-asọpụrụ Jehova. |
1:47 |
Mọm nāwuli kwa n'ọṅù nime Chineke Onye-nzọputam. |
1:48 |
N'ihi na o lekwasiwo obi-ume-ala nke orù-ya nwayi anya. N'ihi na le, site n'oge a, Ọb͕ọ nile gākpọm onye agọziri agọzi. |
1:49 |
N'ihi na onye uku emewom ihe uku, aha-Ya di kwa nsọ. |
1:50 |
Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ nile. |
1:51 |
O werewo ogwe-aka ya rụọ ọrụ dị ike. Ọ chụsasịwo ndị mpako na nzube nke obi ha. |
1:52 |
Ọ chụpụwo ndị dị ike n’oche ha, Ọ bu kwa ndi di ume-ala n'obi ka Ọ buliworo. |
1:53 |
O werewo ihe ọma mejuo ndị agụụ na-agụ, ọ bu kwa ndi-ọgaranya ka o zipuru n'aka efu. |
1:54 |
O werewo ohu ya Izrel, na-echeta ebere ya, |
1:55 |
dika Ọ gwara nna-ayi-hà: nye Abraham na ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” |
1:56 |
Meri we nọyere ya ihe ra ka ọnwa atọ. O we laghachi n'ulo-ya. |
Leave a Reply
You must be logged in to post a comment.